Showing posts with label Southeast Nigeria. Show all posts
Showing posts with label Southeast Nigeria. Show all posts

Thursday, October 02, 2014

Nwulite Asụsụ Na Omenala Igbo

Mwulite Asụsụ Na Omenala Igbo Na Kọleeji Ọzụzụ Ndị Nkụzị: Ụzọ A Pụrụ Ịgbaso

Ebere Dominic Chibuzor
Ngalaba Asụsụ Igbo, Kọleeji Ọzụzụ Ndị Nkụzị Gọọmenti Etiti Dị Na Kano.
dominozion@yahoo.com

Ụmi Edemede
Ọtụtụ mgbe, imeriime ụmụ afọ Igbo anaghị eji asụsụ Igbo ebido ikwu okwu. Tụmadị ndị nne na nna ha rụrụ ọrụ bekee n’obodo ndị mepere emepe na mpụga ala Igbo. Ọtụtụ n’ime ha ji asụsụ a gwara ogwa akọwapụta uche ha. Maka ụmụaka ndị dị etu a, ohere ọzọ ha nwere ịmụta asụsụ na omenala Igbo bụzị n’ụlọakwụkwọ. E ruo n’ ụlọakwụkwọ, ọ naghịkwa adịịmfe n’ihi na ha na-amụzị asụsụ Igbo dị ka asụsụ nke abụọ. Ọnọdụ a wee bụrụ nnukwu ihe ndọlaazụ nye ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. Ụta adịghịrị ụdị  ụmụaka ndị a n’ihi na ọ bụ asụsụ nwata na-anụkarị na gburugburu ebe obibi ya ka ọ na-ebu ụzọ amụta.  Ọ bụ nke a kpatara o ji dị oke mkpa ịchọ ụzọ a ga-esi chọpụta ma gbochie ihe ndọlaazụ niile na-egbochi ezi agamnihu n’ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo n’ụlọakwụkwọ tụmadị na Kọleeji ebe a na-azụpụta ndị ga-akụzịasụsụ ndị a. N’ime nke a, ihe nchọcha a gbasoro usoro nchọcha nkọwasi na nnyocha ya. Ihe nchọcha a gosipụtara na enweghị mmasị so bụrụ nnukwu ihe ndọlaazụ nye ọmụmụ asụsụ na omenala Igbo. Ọ kwadoro usoro nkụzị ga-akwalite mmasị ụmụakwụkwọ n’ọmụmụ asụsụ ụ nke ga-eme ka asụsụ, tụmadịasụsụ nne nọrọ n’ogo kwesịrị ya n’ọmụmụ ihe. N’ikpeazụ, a chịkọtara ihe niile a rụtụrụ aka n’edemede ma site na ya wepụta ndụmọdụ na mmechi zuru oke.